Gender roles: Ọ bụ iwu na nwaanyị ga-ama esi nri tupu ọ lụọ di?

Chiagozie,Uzoamaka na Chukwunaeme
Nkenke aha onyonyo Ndị tinyere ọnụ na mkparịtaụka BBC Igbo nwere n'ụbọchị Fraidee kwuru na ọ bughị iwu na nwaanyị ga-ama esi nri tupu ọ lụọ di

BBC Igbo nwere mkparịtaụka n'ụbochị Fraidee n'ihe omume ha nke a kpọrọ 'Gịnị na-afịọ' nke isi okwu ya bụ, "Ọ bụ iwu na nwanyị ga-ama ka e si esi nri tupu ọ lụọ di?"

Na ya bụ mkparịtaụka, BBC Igbo kpọtara ụmụada Igbo abụọ, Uzoamaka Aniunoh, Chukwunaeme Obiejesi na Obioma Ogakwu, ka ha bia tinye ọnụ na ya bụ okwu.

N'uche ya, Uzoamaka kwuru na ọdikwaghị oke mkpa na nwata nwanyị ga-amụta otu e si esi nri tupu ọ lụwa di, kama na isi nri bụ ọrụ dịịrị ma nwoke ma nwanyị.

O kwuru na ọbụ oge gboo ka a na-asị na ọbụ ọrụ nwanyi isi nri n'ezinaụlọ mana ihe atụghariala ugbua.

Uzoamaka kwuru na "ụmụnwanyị ugbua na-esozi di ha akpata ego, ọtụtụ n'ime ha na-arụ ọrụ bekee maobụ na-azụ ahia nke mere na ha anaghị enwechazị ohere isi nri oge nile."

N'aka nke ọzọ, Obioma kwenyere na o kwesiri ekwesi na nwoke na nwanyị ga-amụta isi nri, mana ọbụ ọrụ nwanyị isiri ezinaụlọ ya nri, nke mere o ji di mkpa na nwanyi ga-ama esi nri tupu ọ lụọ di, mana ọbụghị iwu.

Obioma kwuru na "Ọ bụrụ na nwanyị amachaghị esi nri, di ya akuziere ya. Ọbụrụkwanụ na ego di, ha achọta onye na-esiri ha nri, maọbụkwanụ ha na-azụ nri n'ahia."

Onye nke atọ sokwa tinye ọnụ n'okwu ahụ bu Chukwunaeme Obiejesi.

Obiejesi kwuru na nwoke kwesịrị ịma ka e si esi nri, mana ọ ka mma, dịka omenala Igbo si di, na nwanyị ga-amuta isi nri tupu ọ baa be di.

Ọtụtụ ndi ziteere BBC Igbo ozi n'akara Facebook kwukwara na o dị mkpa na nwanyi toruru ịlụ di kwesiri ịma ka e si esi nri nakwa ka e si eleta ezinaụlo anya.