Igbo festivals: Iri ji Mbaise agbajuola dọrọ tata

Ndị eze
Nkenke aha onyonyo Ndị eze, nze na ọzọ bịara emume Iri Ji Mbaise

Mmemme Iri Ji Mbaise na-akpọtụ ugbua n'ụlọakwụkwọ 'Aboh Mbaise Secondary School' ebe obodo 91 mejupụtara Mbaise na-eri ji ọhụrụ taa bụ Tọzde.

Nkenke aha onyonyo Ji nọ n'ọkụ na-eghe

Iri ji Mbaise bụ nke a na-eme kwa afọ ọbụla ma ọnwa August gbaa iri na ise.

Nkenke aha onyonyo Ndị eze, nze na ọzọ bịara emume Iri Ji Mbaise
Nkenke aha onyonyo Gọvanọ Imo steeti bụ Emeka Ihedioha tụrụ 'down' na Iri ji Aboh Mbaise

Mmadụ puku kwụrụ puku zukọtara kemgbe ụtụtụ ụbọchị Tọzde, ebe ndị mbaise na egosi ejiri mara ha.

Nkenke aha onyonyo Ụmụada Mbaise gwunyere n'emume iri ji ahụ
Nkenke aha onyonyo Ndị Eze-ji Mbaise Mbaise na afọ a

Ndị Eze-Ji niile bugasi ji gbara agba si na obaji ha bịa gosi ya ka ụwa kirie.

Nkenke aha onyonyo Ndị Eze-ji Mbaise nọ n'ihu ọba ji egosiputa aka ọrụ ha n'Iri Ji mbaise 2019

Eze-Ji HRH Eze Mike Ndudiri Orji kwuru na obodo Mbaise bụ ndị kasi ibe ha akọpụta ji, nke mere na ha na ebu ụzọ eme mmemme iri ji tupu obodo ndị ọzọ eriwe.

Nkenke aha onyonyo Ndị otu egwu dị icheiche mere ka emume iri ji ahụ kpoo ọkụ

Ihe nkịrị omenala juputara na iri ji Mbaise nke afọa gụnyere egwu omenala dị iche iche, ịgba mgba, ekike, ịgosi ọba ji nakwa ihe ndị ọzọ.

Lee ihe nkiri iri iji nke ndị mba ọzọ:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdị Abatete n'Anambra steeti mere ihe puruiche na mme mme iri ha
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe omimi dị n’emume Ikeji Arọndizuọgụ
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIri Ji ndị Igbo na Sweden

Lee akuko ga-amasị g

Isiokwu Ndị Emetụtara