Rev Father Mbaka: Ndị chọrọ ka Buhari nwụọ ga-ebu ya ụzọ nwụọ

Ụkọchukwu Ejike Mbaka Image copyright Adoration Ministry/ Getty Images

Ụkọchukwu Ejike Mbaka bụ onyeisi ụka Adoration dị n'Enugwu ekwuola na Onyeisiala Muhammadu Buhari abụghị nsogbu Naịjirịa.

Mbaka kwuru nke a ụbọchị Wenezde n'ọgbakọ ofufe nru ọ na-ehiwe kwa izuụka n'ogige Adọration dị n' Umuchigbo Iji-Nike, Emene, Enugwu.

Fada Mbaka sị na o ruru afọ 16 ndị chịburu Naịjirịa mbụ ji mebicha obodo ma kwukwaa na ndị mmadụ chọziri ka Buhari jiri afọ ole na ole mezie ihe niile.

"Ndị mmadụ na-akọ m ọnụ na m na-akwado Buhari ka a ga-asị na Buhari adịghị eme ọfụma."

Mbaka gara n'ihu sị na ọchịchị Buhari ga-adị, na ndị chọrọ ka ọ nwụọ ga-ebu ya ụzọ nwụọ.

Ọ sị na ya ma na ọ bụ Buahri nọ n'Asọ Rock makana ọ na-echeta nkata ha abụọ kpara tupu ọ bụrụ onyeisiala.

N'okwu banyere ndị na-achi ehi, Mbaka sị na ya nwere ehi, nke mere ya onye ọchịehi.

Lee ihe 20 gbara ọkpụrụkpụ ndị ọzọ o kwuru n' ozi ya:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMbaka sị na Buhari abụghị nsogbu Naịjirịa

1. Buhari abụghị nsogbu anyị, ndị Buhari bụụrụ nsogbu bụ ndị na-ezufu ego

2. Buhari abụghị nsogbu Ndigbo. Kedụ mgbe Buhari banyere n'ọchịchị Naịjịria?

3. Jonathan enyere Igbo Biafra, Buhari jụ inye ụnụ ya? Obasanjo enyere Igbo Biafra, Buhari jụ inye ụnụ ya? Ken Nnamanị bụ onyeisi Sineti, o nyere ụnụ Biafra?

4. N'ọrụ ugbo, Naijiria na-alaghachi ugbua na ị bụ ebe e jiri ịkọpụta ihe ubị mara n'Afrịka

5. Ihe e mebiri n'afọ 16, agaghị edozili ya n'otu afọ

6. Onye bụbụ Mịnịsta Mmanụ bụ Dieaziani ọ bụ na ọ bụghị onye Igbo na-alụ ya?

Image copyright AMEN

7. Ndị gọvanọ chọọ ụzọ ha ga-esi gboo mkpa nchekwa na steeti ha, ọ bụghị Buhari ga-abịa gburu gị anwụ.

8. E kwuru m ka a ghara ime ngagharịiwe maka Fada Offu e gburu ma ọ bụrụ na e meghị nchọpụta ka e were hụ ihe a gbadoro ụkwụ.

9. Esonyeghị m mee ngagharịiwe n'agbanyeghị na m bere akwa maka ogbugbu ya.

10. Ndị wepụtara foto sị na ọ bụ m ebe m so eme ngaharịiwe maka ogbugbu Fada Paul Offu ga-ata ahụhụ.

11. E nwere ndị Fulani bụ ndị ajọ mmadụ na-ememila ndị mmadụ mana ha abụghị ndị ọchịehi. E nwekwara ndị ọchiehi na-eme ihe ọjọọ,

12. E nwekwara ndị Igbo bụ ajọ mmadụ bụ ndị ntọ, ọ bụghị naanị ndị Fulanị

13. Anyị nwere nnukwu nsogbu nke ihe ga-egbo ya bụ inwe ọrụ.

14. Ụfọdụ ndị gọvanọ ga-ezufucha ego, ha agaghị akwụ ụgwọ ọnwa ndị ọrụ.

15 Gọvanọ ọbụla bụ onyeisi nchekwa steeti ya, ha na-ata ego nchekwa kwa ọnwa maka nke a. Kedụ ihe ha ji ya eme?

16. Ndị uweojii na-ejichi ndị Keke na-anapụ ha ego n'ike ọ bụ Buhari na-eme nke a? A na-eme ya n'Ugwu Awụsa?

17. Bịafra, Bịafra, enye Ndigbo Bịafra ugbua, a sị anyị nweta onyeisiala, ndị Anambara a ga-ekwe ndị Imo? Ndị Imo aga-ekwe ndị Enugwu? Ndị Enugwu aga-ekwe onye Ebonyi? Abịa aga-ekwe Imo?

18. Ọ bụrụ na m bụ Ịmam ndị Ugwu, ndị Ugwu ga-echekwa m. Ọ bụrụ na m bụ ụkọchukwu ndị Ọdịda Anyanwụ, ndị Yoruba ga-echekwa m. Igbo nwere eze na-egbu onwe ha.

19. Ha chọrọ igbu Fada Mbaka ka ha bo ya ndị Fulani.

20. Ndị na-eti Biafra Biafra na-egbu oge ụnụ, na-anapụ ụnụ ego.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption2019 Elections: Buhari adaghị ntụliaka n'Enugu edere ya ede - Mbaka

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: