Ngozi Okonjo-Iweala, Uche Jombo na ụmụnwaanyị Abia state aha ha na-ada ụda na Nigeria

Okonjo-Iweala, Uche Jombo, Angela Johnson Image copyright Instagram/Getty Images/ Angela campaign

E nwere obodo a ga-akọgide akụkọ ha ghara ịkọta maka maọbụ kpọta ụmụnwaanyị ha aha?

I cheta ngagharịiwe ụmụnwaanyị Aba nke a ma dịka 'Aba Women's Riot', ị mara na ọ bụghị taa ka ụmụnwaanyị Abịa kpawara ike.

Dịka e si ekwu na "n'azụ nwoke ọbụla na-eme ọfụma, ị ga-ahụ nwaanyị na-akwado ya", etu ahụ ka ọ dị n'obodo dị iche iche.

Na obodo dị mma bụkwanụ na e nwere ụmụnwaanyị na-eme ihe ọma e ji eme ọnụ.

BBC Igbo chọrọ igosi gị ụmụnwaanyị Abịa steeti na-eme/mee ihe ndị mmadụ ga-eji cheta ha.

Angela Johnson

Image copyright Twitter/@AngelaCampaign

Kedụ etu ị ga-esi chefuo aha ya, ọ kachasị etu a o si zọọ ọkwa onyeisiala n'okpuru pati Alliance for a United Nigeria (AUN) na ntuliaka 2019?

Johnson abụghị naanị onye ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ bụkwa onye ọkaiwu, ụkọchukwu nakwa onye na-ede akwụkwọ ndị ụka.

A mụrụ ya n'ụbọchị 16 nke ọnwa Nọvemba, 1959.

Ngozi Okonjo-Iweala

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Okonjo-Iweala bụ minista na-ahụ maka akụnaụba Naịjirịa oge Goodluck Jonathan chịrị Naịjirịa

N'agbanyeghi na a mụrụ ya na Delta steeti, mana a ga-agụnye ya n'okpuru ụmụnwaanyị Abịa steeti makana ọ bụ ebe ahụ ka a na-alụ ya.

A ga-akọ ole ghara ole maka Okonjo-Iweala?

A bịa n'ihe gbasara nchekwa akụnaụba obodo, ọ nọ ya.

A bịa n'ihe gbasara mkpata na mmefu na mbaụwa, ọ kwụ chịm.

Ọ bụ onye ihe gbasara ego na nchịkọta akụnaụba doro anya ọfụma.

A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Juun, 1954.

Nkeiruka Onyejeocha

Image copyright Twitter/ @nkeiruka_reps

Ọ bụ onye ụlọomeiwu nta nakwa onye azụmahịa.

Ọ rụọla dịka onye omeiwu na-anọchite anya ndị Isuikwuato/Umunneochi kemgbe afọ 2007, ka ọ rụchara dịka kọmishọna na steeti ya.

A mụrụ ya n'ụbọchị 23 nke ọnwa Nọvemba, 1969.

Chinyere Kalu

Image copyright Facebook/Nigerian College of Aviation Technology
Nkenke aha onyonyo Kalu enwetala ọtụtụ ihe nrite gbasara aka ọrụ ya dịka ọkwọụgbọelu

Kalu na-azabu Onyenauche (nke bụ aha nna ya), bụ nwaanyị mbụ fere ụgbọelu dịka ọkwọụgbọelu na Naịjirịa.

N'afọ 2006, onye bụ onyeisiala Naịjirịa mgbe ahụ bụ Goodluck Jonathan, nyere ya nturuugo "Member of the Federal Republic of Nigeria".

A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Disemba, 1956.

Nnenna Elendu Ukeje

Image copyright Twitter/HonNnennaElenduUkeje

Elendu-Ukeje arụọla n'ụlọomeiwu nta afọ 12, kemgbe ọ malitere n'afọ 2007.

Ọ na-anọchite anya ndị Bende n'ụlọomeiwu.

A mụrụ ya n'ụbọchị 24 nke ọnwa Ọktoba, 1969.

Arunma Oteh

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Oteh bụ otu onye a na-asị "unu abịala" n'ihe gbasara akụnaụba na mkpata na mmefu ego.

Oteh arụọla n'ọtụtụ ebe aha ha na-ada ụda ma a bịa n'ụwa akụnaụba; nke gụnyere World Bank, Securities and Exchange Commission nke Naịjirịa nakwa Harvard Institute for International Development, dgz.

O nwetala nturuugo 'Officer of the Order of the Niger' na Naịjirịa.

Ọ gụrụ maka kọmputa na mahadum.

A mụrụ ya n'ụbọchị 24 nke ọnwa Jenụwarị, 1965.

Nkechi Justina Nwaogu

Image copyright Facebook/Nkechi Nwaogu
Nkenke aha onyonyo Nwaogu bụbu onye ọrụ ụlọakụ

Nwaogu arụọla dịka onye omeiwu na-anọchite anya ndị Abịa Sentralụ n'Ụlọomeiwu Ukwu kemgbe afọ 2011.

Ọ kwụsịrị ịrụ dịka onye omeiwu n'afọ 2015, mgbe T.A Orji zọtara oche yaTupu ọ banye n'ụlọ omeiwu Ukwu, ọ nọburu n'Ụlọomeiwu Nta bido n'afọ 2003 rue afọ 2007.

A mụrụ ya n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee, 1956.

Adaobi Tricia Nwaubani

Image copyright Adaobi Tricia Nwaubani

Nwaubani bụ onye na-ede akwụkwọ nakwa onye ntaakụkọ a ma ama.

O nwetala ọtụtụ ihe nrite nke gụnyere "Commonwealth Writers' Prize".

A mụrụ ya n'afọ 1976.

Uche Jombo

Image copyright Uche Jombo/ Instagram
Nkenke aha onyonyo Uche Jombo enwetala ọtụtụ ihe nrite maka ime ejije

Ọ bụrụ na ị na-ele ejije ndị Nollywood ma ị maghị onye nwaanyị a bụ, i lewela?

Jombo na-eme ejije dịka "actress" ma na-emepụtakwa ejije dịka "director".

A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Disemba, 1979.

Ihuoma Linda Ejiofor-Suleiman

Image copyright Linda Ejiofor/Instagram

Ejiofor bụ onye na-eme ejije na Nollywood (o so na ndị a na-akpọ ndị Nollywood ọgbara ọhụrụ).

A họpụtala ya maka inweta ihe nrite dị iche iche nke gụnyere "nwaanyị kachasị eme ihe nkiri".

A mụrụ ya n'ụbọchị 17 nke ọnwa July, 1986.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionGịnị ka ị ma maka ‘Nwaanyị Nnewi’?