Child trafficking: Aka ndị uweojii akparala ndị ntọrị ụmụaka n'Imo Steeti

Ndị a na-enyo enyo tọọrọ ụmụaka ndị ahụ Image copyright Nigerian Police

Ndị ngalaba 'Operation Puff Adder' nke uweojii Imo Steeti anwụchiela mmadụ isi ọrụ ha bụ ịtọrị ụmụaka.

N'ụbọchi 24 nke ọnwa Epurel, 2019, nwaanyị aha ya bụ Immaculata Edward sị na ya dị afọ 31 si obodo Okondo dị na Cros Riva Steeti tọọrọ umụaka ise bi na be enye ya nwoke a kpọrọ Ifara Isong bi na Ngor Okpala dị n'Imo Steeti.

Immaculata zuru ụmụaka ise ndị agbataobi enyi ya nwoke ahụ bụ ndị nne na nna ha sịrị ya lekọta ha anya.

Ụmụaka a bụ ndị otu nne mụrụ gụnyere; Somto Eke, nwaanyị dị afọ isii, Kelechi Ekeh, nwoke dị afọ ise.

Ndị ọzọ bụ Chisom Ekeh, nwaanyị dị afọ atọ, Ebuka Enwerem, nwoke dị afọ atọ, Chioma Enwerem, nwaanyị dị afọ ise na Lucky Ida, nwoke dị afọ isii.

Image copyright Nigerian Police
Nkenke aha onyonyo Ụmụaka azọpụtara na ezinaụlọ ha

Immaculata kpọgara ha n'aka onye ama ama n'ịtụ mgbere ụmụaka bụ Perpetual Iwuji si n'Obokwu Ulakwo, Imo Steeti.

Perpetual kpọrọ ụmụaka abụọ n'ime ndị a ma ree ha n'aka Grace Nwachukwu si Aboh Mbaise ma biri na Mpape Abuja.

Immaculata zukwara ụmụaka abụọ bụ ụmụ nwanne nna ya si na Cross River Steeti ma ree ha n'aka Ifeoma Ndubuisi si na Lokpanta Abia Steeti.

Image copyright Nigerian
Nkenke aha onyonyo Nwata azọpụtara na nne na nna ya

Site na nyocha tara ọchịchị ndị uweojii, a chọtala ụmụaka niile ahụ a tọọrọ ma tinye ha n'aka ezinaụlọ ha.

N'ime nyocha ahụ, azọpụtara ụmụaka ise ọzọ n'aka Perpetual Iwuji ma ziga ha n'ụlọ ebe a na-elekọta ụmụaka.

Ndị a na-enyo enyo n'aka ha dị na nke a gụnyere Perpetual Iwuji, Isong Ifara, Immaculata Edward, Grace Nwachukwu, Ifeoma Ndubuisi na Stephen Ezenwa.

Ịtụ mgbere ụmụaka abụghị ihe amaghị maka na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a