2019 Election: Rochas o ji otu ụkwụ nọrọ n'APC?

Akụkọ dị mkpa

Imo steti Image copyright @APCWAY2019/bbc

"Ọ bụ nwa m Uche Nwosu nọ na pati Action Alliance ga-achị Imo steeti."

"Mba ọ bụ Hope Uzodimma nke APC ga-azọta oche gọvanọ n'Imo steeti."

Ndọrọndọrọ a mere n'etiti nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari nakwa Rochas Okorocha mgbe nwunye osote onyeisiala Dolapo Osinbajo nọchịtere anya Aisha nakwa ndị otu pati APC ngalaba

ụmụnwaanyị na ụmụ ntoroọbịa gara ịchụ nta vootu na steeti ahụ n'ụbọchị Satọde gara aga.

Ihe ndị ọzọ mere ebe ahụ:

  • Okwu Rochas mere ka ndị isi pati APC si na steeti ise dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ si n'ọgbakọ ahụ pụọ.
  • Onyeisi ụmụnwaanyị na pati APC bụ Salamatu Eluma rịọrịọ ndị Imo ka ha tụnyere Buhari nakwa ndị otu APC na-azọ oche ọchịchị na mpaghara ọwụwa anyanwụ.
  • Okorocha kwuru na ọ bụ Uche Nwosu ga-emeri na ntuliaka na-abịanụ.
  • Hope Uzodimma site ọnụ na-ekwuchitere pati APC n'Imo bụ Enyinnaya Onuegbu kwuru na e hibere ya bụ achụmta vootu ka ewe tee ya ule n'ihu.
  • Onuegbu kwuru na Okorocha na-alụ ọgụ ka onye dara mmiri nakwa na ọ ga-ada mmiri makana Uzodimma na Buhari ga-emeri na ntuliaka na-abịanụ.
  • Mgbe BBC Igbo juru ọnụ na-ekwuchitere uweojii n'Imo bụ Godson Ikeokwu ị jụta ya maka akụkọ kwuru na mgbọ egbe tụtụ ụmụnwaanyị abụọ n'ọgbakọ ahụ , o kwuru na ọ maghị maka ya kama na ọ ga-eme nyocha ma gwa anyị nke bụ eziokwu.

Obiano kwụsị ịkwadọ nghọpụtagharị Buhari - Atiku-Obi Campaign Organisation

Image copyright GovernorObianoFacebook
Nkenke aha onyonyo Gọvanọ Willie Obiano nọ n'agba nke abụọ ya dịka onye mbụ na'Anambra Steeti

Otu kpọrọ onwe ha Atiku-Obi Campaign Organisation adọọla gọvanọ Anambra Steeti bụ Willie Obianọ ka ọkwụsị ịna chụrụ onyeisiala Buhari nta vootu.

Onyeisi ha bụ Harry Oranezi kwuru n'ozi owepụtara kwuru na nke a megidere ebumnobi ndị Igbo gbaa gburugburu.

Anyị achọpụtala ndị ozi Boko Haram - Ndịagha Naịjirịa

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mgbe Ndị agha turu ọnụ na ha anwụchiela Shekaụ ma ọ dị ndụ akpagharị

Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ụfọdụ ndị na-ere nkụ na Borno Steeti na-enyere ndị Boko Haram aka site n'izigara ha nri, ọgwụ mmanụ ụgbọala na ihe ndị ọzọ eji ebi ndụ.

Onye ndu ndị nke ngalaba 7 Division bụ Brig. Gen Bulama Biu kwuru nke a mgbe ọ na-azụ ajụjụ banyere mmachi ha machiri ndị na-ere nkụ n'ogbe ahụ.

N'ofesi

Image copyright Reuters

Ihe ruru mmadụ anọ anwụola site na mgbawa mmansụ gaasị bụ nke mere n'etiti obodo Paris dịka ndị ọrụ gbatagbata chọpụtara ozu otu nwaanyị.

Ọkụ ọgbụgba a gbukwara ndị na-agbanyụ ọkụ mmadụ abụọ ebe ọtụtụ merụrụ ahụ gụnyere okporoụzọ na ngwongwo lara n'iyi.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionTraditional Retirement:'Ịgba Ọtaọmụ bụ ihe anyị emepe obodo' - Ndị Amaekpu Ohafia

N'ofesi,

Image copyright Reuters

Aka na-achị South Afirika bụ Cyril Ramaphosa arịọla ụmụnwoke ka ha jịkọta aka kwụsị oke mmetọ ahụ na-eme na mba ahụ makana ọ bụrụla nnukwu nsogbu.

Ebe,

Image copyright AFP

Odee akwụkwọ Mba U.S bụ Mike Pompeo kwuru na a ga-enweli nkwekọrịta n'etiti Amerika

na Turkey iji wee chekwa ndị ọgụ Kurdish na-alụ ọgụ na Syria ka Amerika pụchara na mba ahụ.

N'egwuregwu,

Asọmpi Naịjirịa Professional Football League ga-amalite taa bụ Janụary iri na atọ, 2019.

Kwara united ga-ezute Sunshine stars ebe MFM fc ga-ezute Eyimba FC n'ọgbọ egwuregwu ọhụrụ Eyimba dị n'Aba.

Nkeji nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla