Ụlọịkpe mkpegharị ebelatala afọ ole Dariye ga-anọ n'ụlọ mkpọrọ

Akụkọ dị mkpa taa

Image copyright Joshua Dariye/Facebook

Otu ụlọịkpe n'Abuja ebelatala afọ ole aka chịbụrụ Platu steeti bụ Joshua Dariye ga-anọ n'ụlọ mkpọrọ.

Cheta na-atụrụ Dariye nga n'ọnwa Juun afọ a mgbe ikpe mpụ na nrụrụraka egọ mara ya.

Ozo,

Image copyright Rita Maduagwu

Otu APGA n'Anambra steeti ekwuola na ha kwudosi ike n'ọchụchụ achụrụ ndị omeiwu atọ n'ọrụ ụnyaahụ.

Ha kwuru na nke a mere n'ihi na ndị omeiwu ahụ kpara nkata chutu Rita Maduagwu emeghi ya n'ụzọ kwesiri. Nke a pụtara na ha dara iwu.

Na mba ofesi

Image copyright BBC/Poly Muzalia

Ndị uweojii na mba Congo agbagbuola ụmụakwụkwọ abụọ n'isi obodo ha bụ Kinshasa ebe ha na-eme ngagharị iwe.

Ụmụakwụkwọ ahụ si Mahadum Kinshasa na-eme ngagharị iwe maka ndị nkuzi gbara abụbọ ọrụ n'ihi ụgwọ ọnwa ha.

N'egwuregwu

Dịka otu eguwregwu Naịjirịa na-akwado izute Bafana bafana nke sawt Afrịka echi, Ahmed Musa ekwuola na ha dị njikere maka asọmpị a.

O gwara ndị ntaakụkọ na obi ruru ha niile ala.

Gee Nkeji nke mgbede a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla
Nkenke aha onyonyo Nnia Nwodo malitere dịka onye ndụ nke itolu (9) ndị Ohaneze ndị Igbo na 2017

Onye ndu IPOB na mba ofesi bụ Paul achala akatọọla okwu onyeisi ọhaneze ndị Igbo bụ Nnia nwodo kwuru.

Achalla kwuru na o nweghị onye na-anụ ọgụ ọzọ kama na ihe ndị otu Ipob chọrọ nye ndị Igbo ohere ka ha tụọ vootu referandum gosiri ebe ha kwụ.

Ọ gwara BBC Igbo na onweghị ihe IPOB ji okwu Nnia Nwodo e mee makana ọ na-ekwuru onwe ya.

N'onụ ya, "anyị kwetere na Ọhazurume karịa onye kwụ nanị otu onye ị bịa na-ekwu ihe ọ na maghị."

Onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ Nnia Nwodo ekwuola na ndị Igbo agaghị eji ngwa egbe alụ ọgụ ọzọ iji nwete mwereonwe Biafra.

O kwuru nke a n'emume mpụta n'akwụkwọ ụfọdụ ụmụakwụkwọ Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu n'Anambra Steeti.

Nwodo kwuru na ọ bụ agha Biafra butere ọnwụ ọtụtụ nde ndị Igbo ma lakwa akụnaụba ha n'iyi, ọ rụtụrụ aka na ọnụọgụgụ a na-enye n'akwụkwọ akụkọ abụghị nke ọma ya n'ihi na enyeghi etu esi agụkọ ya.

Buhari saa anya gị maka ndị gọvanọ ọjọọ - NLC

Image copyright Getty Images

Otu jikotara ndị ọrụ na Naịjirịa adọọla onyeisiala Muhammadu Buhari aka na ntị ka ọ kpachapụ anya maka ndị gọvanọ na-emegide ndị ọrụ na Naịjirịa.

Onyeisi ha bụ Ayuba Wabba kwuru na ụfọdụ ndị gọvanọ na-achọ imebi mkpebi ndị ọrụ na Gọọmentị etiti nwere n'ụgwọ ọnwa opekatampe puku naịra iri atọ.

Mkparịta ụka ASUU na Gọọmentị etiti

Image copyright Getty Images

Mkparịta ụka mere n'etiti gọọmentị etiti na ndị nkuzi Mahadum na Naịjirịa n'ihi abụbọ ọrụ amịtabeghi mkpụrụ ọbụla dịka ebufere izuụka ọzọ.

Ndị nọ n'isi oche mkparịta ụka ahụ gụnyere minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige na onyeisi ndị nkuzi mahadum bụ Biodun Ogunyemi.

Na Kalifonịa

Image copyright AFP/Getty

Ihe karịrị mmadụ narị isii ka na-efu efu n'ọkụ ọgbụgba na-agba na mpaghara ukwu nke Kalifonịa ebe ahụla ozu mmadụ asaa ọzọ.

Onye ọrụ n'ogige ahụ bụ Kory Honea kwuru na ihe ize ndụ so ọkụ ọgbụgba ahụ emeela ka a ghara ịmatacha ọnụ ọgụgụ ndị na-efu efu.

N'egwuregwu

Alex Iwobi, Kelechi Iheanacho na Ahmed Musa ga-ebu ndị Super Eagles gaa asọmpi itozuoke Iko mba Afrịka ha na ndị Saụt Afrịka ga-agba.b

Cheta na n'afọ 2017 ndị Saụt Afrịka gbara Super Eagles ọkpụ abụọ n'ọgbọ egwuregwu dị n'Uyo.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhere adịghị na nwoke ị mee nwaanyị mbọ -Onyedika

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a