Theresa May na-abịa Nigeria izute Buhari taa

Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:

Theresa May na-abịa

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Theresa May na Buhari zuteburu na UK n'ọnwa Epreelụ nke afọ a

Theresa May bụ Praịm Mịnịsta ndị Briten ga-esi mba Saụt Afrịka bata Nigeria taa ebe ya na Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-akpa maka azụmahịa, nchekwa nakwa ịgba mgbere mmadụ.

Ipob

Otu Ipob enyela iwu sị ka ndị Igbo niile na-akwado ha ghara ịpụta ezi n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Septemba.

Image copyright Getty Images

Ha chọrọ iji ụbọchị ahụ ruo uju iji gosi iwe ha maka ndị ha sị nwụrụ n'egwu eke ndị agha Naịjirịa gbara n'Afaraukwu dị n'Ụmụahịa nakwa Ngwa, Aba na Port Harcourt, n'ụbọchị ahụ n'afọ gara aga.

Gụọ ya n'uju ebea: Ipob sị Igbo apụtala n'ụbọchị 14 nke ọnwa Septemba

Ihe na-eme na Bornu

Afọ na-achọ isagbu ndị mmadụ na Bọrọnu steeti.

Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ bụ Haruna Mshelia kwuru na ihe karịrị mmadụ puku na-arịa ọrịa afọ ọsịsa, ebe mmadụ iri abụọ na ise nọ n'ụlọọgwụ maka ọrịa a si na mmiri ha na-an̄ụ.

Gụọ ya n'uju ebea: Ọrịa afọ ọsịsa etipuola na Borno

N'egwuregwu,

Roger Federer meriri Yoshihito Nishioka iji banye n'agba nke abụọ n'asọmpi US Open, ebe Caroline Wozniacki meriri Sam Stosur iji gafee.

Image copyright Getty Images

Wozniacki bụ onye abụọ n'ọkwa onye kachasị apịa tenis na mbaụwa ebe Federer bụ onye abụọ n'ụmụnwoke kacha apịa.

Gere akụkọ dị mkpa n'ụtụtụa n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri nke taa:

Atụmatụ nke gọọmenti etiti hiwere iji na-enye ndị ụwa na-atụ puku naịra ise kwa ọnwa ebirila ọkụ n'ebe ụfọdụ na Naijiria.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLee ndị natara N5000 gọọmenti etiti na-enye ndị ogbenye

Isiokwu Ndị Emetụtara