Akụkọkachasị n'ụtụtụ a: Ndị uweojii anwụchiela Dino Melaye ọzọ

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a:

Ndị uweojii anwụchiela Sịnetọ Dino Melaye ọzọ

Image copyright @dino_melaye

Ndị uweojii anwụchiela Sịnetọ Dino Melaye ọzọ bụ onye si n'ụgbọala wụtuo ma gbaa ọsọ mgbe ndị uweojii kpọya na-aga n'ụlọikpe dị na Lokoja.

Anwụchiri ya n'ụlọọgwụ Zankli dị n'Abuja, ebe ọ na anara ọgwụgwọ maka mmerụ ahụ onwetara n'ọsọ ahụ ọgbara.

Ndị bi na ndị na-azụ ahịa n'Owerri ebela akwa n'ihi nhaziharị obodo Rochas na-eme

Image copyright Rochas Okorocha Facebook

Ndị bi nakwa ndị n'azụ ahịa n'owerri nọ zị n'ịta ikikere eze ugbua maka atụmatụ mwogharị obodo nke Gọvanọ Rochas Okorocha hiwere

Mwogharịa butere nkutusi ụlọahịa, ụlọ obibi, na ụlọụka nakwa mgbochi njem ndị mmadụ n'ebe ahụ.

Donald Trump na Emmanuel Macron atụọla alọ ọhụrụ

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron nwere tụrụ alọ i nwe nkwekọrịta ọhụrụ banyere mmepụta ngwaagha nuklịa nke ndị mba Iran.

Ha mere nke a na njem nleta Macron gara na mba Amerịka.

Taa bụ ụbọchị ehiwara maka ịchụ ọrịa ị ba na mba ụwa niile

Image copyright Getty Images

Taa bụ ụbọchi otu na-ahụ maka ahụike n'ụwa wepụtara maka mbọ ịchụ ọrịa ịba ọsọ nke isi okwu ya bụ "Dị njikere imerị ọrịa ịba'

Ha kwuru na Afrịka nwere pacent iri itoolu n'ọrịa ịba ebe ogbuola ihe ruru pacent iri itoolu na otu

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Mohammed Salah nwuru ka ọnwa n'abalị dịka ndị Liverpool jiri ọkpụ ise asatara otu merie ndị abụọ merie ndị AS Roma.

Nke a mere ka Liverpool manye otu ụkwụ n'ime agba nke ikpeazụ n'asọmpi Uefa Champịọns.

Gere akụkọ mere n'ụtụtụ a n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri nke taa:

Naeto C kwuru na ezinaụlọ dị ya mkpa karịa iti egwu

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNaeto C: Ịlụ nwaanyị abụghị ihe egwuregwu