Divorce in Nigeria: Kedụ etu ị ga-esi ama ma ị ga-atụnyeli nwaanyị ime?

Nwoke na ụmụ ya nwaanyị Image copyright Sunday Times

Nwoke ọ ga-amanwụ ma 'opi' ya ọ na-arụ ọrụ ka ọ bụ na ọ naghị arụ ọrụ?

O nwere ike ịtụnye nwaanyị ime ka ọ bụ na o nweghị ike ya?

Kedụ etu nwoke ga-esi ama ma utu ya ọ na-ekeli maọbụ o nwere ike ijidegide nkeli?

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe ụmụnwaanyị chere maka utu nwoke

Ihe ndị a bụ ajụjụ a kpụ n'ọnụ dịka otu ụlọikpe dị n'Igando, Legọs gbasara di na nwunye maka ebubo na nwoke anaghị atunyeli nwaanyị ime.

Dịka ụlọakụkọ Punch siri dee, Monday Adiri na-ebo nwunye ya ebubo sị : Nwunye m na-emebọ n'ihu ọha. Ọ na-agwa onye ọhụla na ọ bụghị m mụrụ nwa anyị nwaanyị."

"Ọ na-akpọ m onye amụ ya anaghị ekeli."

Image copyright Getty Images

Dọkịta ọkachamara n'ihe gbasara amụtaghị nwa bụ Dkta Adewonuola Ajayi kọwara BBC etu nwoke ga-esi ama na utu ya anaghị ekeli.

"Nwoke teta ụra n'ụtụtụ , o kwesịrị ka amụ ya kelie ma kwụrụ ọtọ."

"Ọ bụrụ na o meghi otu a, o nwere ike ịbụ na o nwere nsogbu."

Ihe ndị nwere ike ibute nsogbu ndị a gụnyere nsogbu Bekee kpọrọ 'endocrine problems'; urological problems' nakwa oke echiche.

Dkta Adewonuola Ajayi gara n'ihu kwuo sị,"oke echiche na nchekasị nwere ike ibute amụ nwoke ekelighi."

Kedụ ka nwoke ga-esi ama ma ọ ga-atụnyeli nwaanyị ime?

Ụzọ doro anya nwoke nwere ike isi mata nke a bụ site na nnyocha mmiri ahụ ya.

Ajayi kọwara: "Nwoke kwesịrị ime nnyocha iji mara ma ọ ga-atụnyeli nwaanyị ime."

Ihe dị iche n'etiti 'impotence' na 'infertility'

" Impotence' bụ nsogbu na amụ nwoke enweghị ike ikeli mana 'infertility' bụ na nwoke enweghị ike ịtụnyenwụ nwaanyị ime."

O kwukwara sị na ha abụọ abụghị otu mana 'amụ nwoke ekelighị' nwere ike ibute 'amụghị nwa.'

"Amụtaghị nwa bụ di na nwunye enweghị ike ịdị ime na-agbanyeghị ime mmekọrịta nwoke na nwaanyị rue otu afọ."

Ọkachamara ọzọ n'ihe gbasara amụtaghị nwa bụ Dkta Abayomi Ajayi nke 'Nordica Fertility Centre' dị na Legọs kwuru na nwoke inwe nsogbu amụtaghị nwa abụghị n'ụwa ya agwụla n'ihi na ụzọ mgbapụ dị.

"Ọ bụrụ na nwoke nwere olulo (sperm), a ga-egbonwu nsogbu atụnyelighi nwaanyị ya ime. E nwere ike iji ya mee ka nwunye ya tụrụ ime."

Akụkọ ga-amasị gị: