Gorilla: Ọzọdịmgba eloro nde naira asaa n'ogige ụmụanụmanụ nke Kano?

Ọzọdimgba Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọzọdimgba ana-ebuzi ego?

Ndị uweojii na-ekwu na ha na-enyocha ihe mere ego ruru nde naira asaa bụ ego na-efu n' ogige ụmụanụmanụ, Kano Zoological Gardens, dị na Kano.

N'ụbọchị Wenezde, onyeisi nnakọta ego n'ogige ụmụanụmanụ ahụ kwuru na nde naira isii,narị asatọ na puku iri abụọ ha nwetara n'oge emume Sallh bụ ego ndị mmadụ kwuru were bata kirie ụmụ anụmanụ adaala mmiri.

BBC enweghị ohere ime nchọpụta ka onwe ya. mana ndị ụlọakụkọ Freedom Radio Kano kwuru ụbọchị Tọọzde na otu n'ime ndị odebe ego ụlọụ ahụ kwuru na ' " otu ọzọdịmgba rịbatara n'ụlọrụ ha buru eego ahụ lomie."

Mbọ BBC gbara ịnụta olu onyeisi ụlọanụmanụ ahụ amịtyaghị mkpụụ, n'ihi na o kweghị kwuo ma akụkọ ahụ emer eme ka ọ bụ na omeghị.

" A ka na-enyocha ihe mere ugbua, achọghị m ikwu ihe ọbụla banyere ya."

Otu onye na-arụ n'ụlọọụ ahụ nke achọghị ka a kpọrọ aha ya gwara BBC na ndị uweojii achụchiela ndị niile nọ ọrụ mgbe ya bụ ihe mere.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLekwa agwọ loro nde naira 36

Mgbe BBC kpọtụụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kano bụ Abdullahi Haruna, ọ sịị na, "ọ bụ eziokwu na ego a nakọtara n' abali ise e mere emume 'Sallah' na-efu efu.

Ka ọ dị ugbua, anyị anwụchiela mmadụ iri bụ ndị ọrụ ụlọ ụmụanụmanụ ahụ . Ha nọ na CID ugbua."

"Ndị anyị nwụchiri gụnyere onye ncheọnụama ụlọụlọanụmanụ ahụ na ndị na-arụ na ngalaba nchịkọta ego."

Ihe anyị na-aghọta n 'okwu ahụ bụ mgbe ịnwetara ego abalị ise hapụ iburu ya ga dowe n'ụlọakụ."

Haruna kwuru na ndị ha ji eji ugbua bụ ndị nche nakwa ụfọdụ ndị na-ahụ maka ego n'ụlọ ụmụanụmanụ ahụ, ka ha kọwaa ihe kpatara na ha eburughi ego ahụ buga n'ụlọakụ.

Cheta na n'ọnwa Febụwarị, onye ọụ Jamb kwuru na agwọ loro nde naiora iri atọ na ise.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara