Lassa Fever Outbreak: Ọrịa Iba Lasa awakpoola Naịjirịa ọzọ - NCDC

Akụkọ dị mkpa:

Image copyright Getty Images

Ngalaba na-ahụ maka ọgwụgwọ ọrịa na-efe efe akpọrọ NCDC n'ịchafụ ekwuola na ọrịa Iba Lasa awakpoola ala Naịjirịa ọzọ.

N'ime akwụkwọ ozi ha ziputere ha kwuru na ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa ahụ arịala elu kemgbe afọ 2019 bidoro.

Ha kwuru na ihe ruru mmadụ iri isii si na steeti asatọ bụ ihe bu ọrịa a.

Steeti ndị ọ metụtara bụ Ebonyi, Edo, Ondo, Bauchi, isi obodo Abuja, Platu nakwa Taraba.

Ọgbakọ ndị chịbụrụ ekwetala ka a kwụọ 27,000 ụgwọ opekatampe

Image copyright "NGRPresident

Na nzụkọ ha mere n'Abuja ụbọchị Tuzde,ndị chịbụrụ na ndị na achị ala Naijiria nke a kpọrọ, 'National Council of State na bekee akwadola ka gọọmenti etiti bido kwụwa N27,000 dịka ụgwọọnwa opekatampe.

Otu jikọrọ ndị ọrụ na-etibu mkpu ka akwụwa ha N30,000 dịka ụgwọọnwa opekatampe.

Gọọmenti chọrọ ka Onnoghen tinye akwụkwọ arụkwaghịm

Image copyright National Judicial Council

Gọọmenti etiti ekwupụtala mmasi ya ka Ọkaikpe Ukwu Naijiria bụ Walter Onnoghen rituo n'ọkwa ya.

Aliu Umar, onye bụ okpe ikpe gọọmenti etiti (Chief prosecutor), kwuru nke a ụbọchị Tuzde n'ikpe Onnoghen n'Abuja sịrị na e degarala Onnoghen akwụkwọ mana ọ maghị ma ọ natakwara ozi ahụ ka ọ bụ na ọ nataghị ya.

Jọstis Walter Onnoghen, ọkpaikpe ukwu Naijiria abịaghị ikpe ahụ.

Onnoghen na-azara ọnụ ya maka ebubo ekwupụtaghị akụnaụba ya niile kemgbe ọ batara n'ọkwa Ọkaikpe ukwu na agbanyeghị na o megidere iwu Code of Conduct Act.

Wole Olanipekun, onye na-edu ndị ọkaiwu na-ekpechitara Onnoghen kwuru na ọnnoghen abịaghị ikpe ahụ n'ihi ikpe ndị a gbarala ụlọikpe CCT banyere okwu ahụ.

N'izuụka gara aga, otu ụlọikpe ukwu nyere mkpebi ka a kwụsịtu ikpe Onnoghen mana ndị na-akwado gọọmenti kwuru na o nwere ka ọ dị.

N'egwuregwu,

Ụwa niile na-atụ egwu na otu onye ọgbaa bọọlụ mba Briten bụ Emiliano Sala anwụọla dịka ụgboelu bu ya aga Cardiff furu efu n'eli igwe.

Ndị ọrụ nzọpụta na mba Briten ebidola ịchọ ya ma n'elu igwe ma n'ime mmiri.

Akụkọ BBC Igbo na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Afe Babalola chọrọ ka a na-eme ule mpụta na mahadum

Image copyright @Abuad_U
Nkenke aha onyonyo Afe Babalola bụ onye nwe Afe Babalola University dị n'Ondo steeti

Otu onye nwere mahadum na Naijiria bụ Afe Babalola akpoola oku ka a na-enwe otu ule maka ndị niilenọ n'afọ ikpeazụ na mahadum.

Babalola,onye kwuru nke a n'emume ịnabata ụmụakwụkwọ ọhụrụ e mere na Mahadum ya bụ Afe Babalola University n'Ado-Ekiti, Ekiti steeti kwuru nke a ga-enye aka ikwalite ezi agụmakwụkwọ na Naijiria.

Ọgbakọ gọọmenti etiti na ndị ọrụ nkuzi mahadum mere

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ

Ọgbakọ gọọmenti etiti na ndị ọrụ nkuzi mahadum mere n'abali Monde amitaghị mkpụrụ dịka enweghị nkwekọrịta ha nwere.

Onyeisi otu Asuu bụ Abiodun Ogunyemi gwara ndị ntaakụkọ na ' nzukọ ahụ ebighị okwu", na ha na- alọghachi ka ha na ndị otu ha kpa na ọ bụ mgbe ha kpachara ka ha ga agwa ọha ihe ha kpebiri.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMkparịtaụka Obasanjo na BBC

Atiku ka Buhari mma-Obasanjo

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Obasanjo chịrị Naịjirịa afọ asatọ na ọchịchị onye kwuo uche ya

Onye bụ onyeisiala Naịjirịa ochie bụ Olusegun Obasanjo ekwuola na agbanyeghị na Atiku Abubakar abụghị onye nsọ, na ewepụta Buhari na Atiku ọ ga aka mma ị hara Atiku.

Obasanjo kwuru nke na mkparịtaụka ya na BBC nwere kwuru na , "Site n'ihe m huru n'aka Buhari- amaghị ọrụ ma ncha, ịkpa oke, nrụrụaka, adịghị ike ahụ, adịghị ike nke uche na ihe niile ndị ọzọ were ya tụnyere Atiku. Atiku ga-agbali mmaji abụọ karịa Buhari."

N'ofesi

Image copyright STEPHANE DE SAKUTIN

Onyeisiala mba Cannada bụ Justin Trudeau nabatara akwụkwọ ozi nke mmadụ otu narị na iri anọ ndị welitere isi na gọọmenti na ndị nkuzi mahadum na Canada dere igi kpọọ oku ka mba China tọghapụ ndị mba ha abụọ China ji eji maka ebube inyopu ala na mba China.

N' egwuregwu,

Image copyright Getty Images

Otu Manchester City nwere ike Iregharị onye egwu ha bụ Tosin Adarabioyo, onye ha binyeburu otu egwu bọọlu West Brom.

Oge ọ na-agbara ndị West Brom gbaturu nke mere ndị Man City ji chọọ izipụ ya ebe ọzọ.

Isiokwu Ndị Emetụtara